Onu M. Agha1,Egwu R.O. Uka2, Ngozi Emeka-Nwobia3, Obianika C. Evelyn4, Eze A. Maudline5& Ekwe M. Ayaru6
1, 2, 3, 4, 5 &Department of Languages and LinguisticsEbonyi State University, Abakaliki, Nigeria
Corresponding Author’s E-mail:mercyaghaonu@gmail.com
Ụmị
Mbịakọ ma ọ bụ mmekọrịta asụsụ bụ mgbe asụsụ abụọ ma ọ bụ kaịrịa nwere mmekọrịta. Ya bụ mgbe ọ bụla ndị na-asụ asụsụ dị iche iche bịakọrọ ọnụ ma ọ bụ nwere mmekọrịta, asụsụ ha na-emetụta onwe ha. Asụsụ nke ọ bụla nwere ike imetụta nke ọzọ n’ebe ọ pụrụ iche nke na o nwere ike iweghara ọnọdụ nke ọzọ ma ọ bụ meeka enwee mgbanwe n’ebe ụfọdụ. Mgbe e nwere mbịakọ asụsụ, asụsụ ndị ahụ bịakọrọ nwere ike ịmakọ, gbaziri okwu ma ọ bụ nwee mgbanwe na ụfọdụ mkpụrụ okwu ha.Nchọcha a chọrọ ịma ma mbịakọ olu ndị Ẹdda bịakọrọ n’olu Igbo ndị ọzọnwere out o siri wete mgbanwe olu ndị ahụ. Kpọmkwem, mbunuche nchọcha a bụ ịmata ụdị mgbanwe ndị pụtara ihe n’olu ndị Ẹdda. Nchọcha a gbasoro usoro sosholingwisitik langueji kọntakiti. A chọpụtara na dị ka olu ndị Ẹdda na asụsụ ndị Igbo ndị ọzọ na abịakọ na-enwe mmetụta olu asụsụ ahụ na-agbanwe. Ihe ndị na-ebute mgbanwe ahụ gụnyere mbịakọ asụsụ, mmekọrịta, nlụkọrịta di na nwunye na ebe onye bi dg. A chọpụtakwara na mgbanwe a na-ahụta n’olu ndị Ẹdda enweghị usoro, ma ndị bi n’ime obodo, ma ndị bin’ụzọ ije socha na mgbanwe a. Otu aka ahụ kwa mgbanwe a kacha pụta ihe n’etiti ụmụ na-eto eto. Ụdị mgbanwe achọpụtara n’olu ndị Ẹdda gunyere; mgbanwe nke ụda, mgbanwe nke ọdịdị, mgbanwe nke nsirmmebe, mgbanwe nke usoro okwu na mgbanwe nke echiche. Ndịnchọcha tụnyere aro ndị a: ka ndị nkuzi gbalịsie ike tinye n’ọrụ ihe “Policy on Education” kwuru maka iji asụsụ epum akụziri ụmụ aka ihe n’ogugo mbido agụmakwụkwọ. Ezinaụlọ, dị ka ebe mmụta na-ebido, ga-agbalịsie ike kụnye n’ime ụmụ aka inwe mmasị na ugwu nye asụsụ ha n’ihi na ọ bụrụ na ha nwee mmasị na ugwu nwe asụsụ ha, ha ga-achọ ịsụ ya mgbe niile. Ndị ọchịchị wepụta otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ a ga-akpọ “Igbo ga-adị”, a ga-eji na-asụ naanị Igbo onweghi asụsụ ọzọ a ga-anabata n’ụbọchị ahụ n’ụlọ ọrụ nakwa ebe ndị ọzọ.
Full Paper